Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akụzi Eziokwu

Na-akụzi Eziokwu

Malite n’ọnwa Septemba, o nwere ihe ọhụrụ a kpọrọ “Na-akụzi Eziokwu” ga na-adị n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ọ ga na-adị n’ebe ahụ a na-ede “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Anyị ga-eji ajụjụ na amaokwu Baịbụl ga-adị na nke ọ bụla kọwaa otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ dị́ na Baịbụl.

Ọ bụrụ na onye anyị ji ya zie ozi ọma nwere mmasị, anyị nwere ike inye ya akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ kpọnyere ya otu vidio dị́ na jw.org/ig, anyị na ya eyizie nletaghachi. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ gaghachi na nke onye ahụ n’egbughị oge ma nyekwuoro ya aka. A ga-ejikwa ihe ọhụrụ a eme ihe omume ụfọdụ dị n’agba a na-akpọ Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. Ebe a ga-esi nweta ihe ga na-adị n’ihe ọhụrụ a bụ n’ebe ahụ a chịkọtara isiokwu nke ọ bụla dị́ n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ị gaa n’akwụkwọ ahụ, ị ga-ahụ ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ọzọ ga-enyere gị aka ka i jiri naanị Baịbụl mee nletaghachi ma ọ bụ mụọrọ mmadụ Baịbụl.

E nwere naanị otu ụzọ e si enweta ndụ. (Mat. 7:13, 14) Ndị anyị na-ezi ozi ọma si n’ebe dị iche iche, na-ekpekwa okpukpe dị iche iche. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkụziri onye nke ọ bụla ihe otú eziokwu dị na Baịbụl ga-eru ya n’obi. (1 Tim. 2:4) Ọ bụrụ na eziokwu dị na Baịbụl edokwuo anyị anya, anyị amụtakwuokwa otú anyị ga-esi na-akụziri ya ndị mmadụ ha aghọta ya, anyị ga-enwe ike inyere ha aka ịmara Chineke. Ọ ga-emekwa ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.—2 Tim. 2:15.