Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ụlọ Nche Pụrụ Iche Anyị Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Septemba

Ụlọ Nche Pụrụ Iche Anyị Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Septemba

O nweghị onye n’ime anyị nkasi obi na-adịghị mkpa. (Ekli. 4:1) N’ọnwa Septemba, anyị ga-agbasi mbọ ike kesaara ndị mmadụ Ụlọ Nche kwuru gbasara nkasi obi. Ebe ọ bụ na anyị chọrọ ịhụ ndị mmadụ ihu n’ihu ma kasie ha obi, anyị agaghị edewe Ụlọ Nche ahụ na nke ndị na-anọghị n’ụlọ.

IHE E NWERE IKE IKWU

“O nwere mgbe ụfọdụ nkasi obi na-adị anyị mkpa. Ma, ònye ka i chere ga-akasili anyị obi? [Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.] Ụlọ Nche a kwuru otú Chineke na-esi akasi anyị obi.”

Ọ bụrụ na o nwere mmasị ma nata magazin ahụ, . . .

KPỌNYERE YA VIDIO BỤ́ OLEE URU ỊMỤ BAỊBỤL GA-ABARA GỊ?

Gwazie ya na ị ga-abịa ka gị na ya mụwa Baịbụl.

GWA YA IHE UNU GA-ATỤLE N’OGE ỌZỌ

Tọgbọrọ ya ajụjụ ị ga-aza ma ị bịa oge ọzọ. Dị ka ihe atụ, “Gịnị mere Chineke ji hapụ anyị ka anyị na-ata ahụhụ?