Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-amụrụ otu nwaanyị ihe na Chili

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Disemba 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta, nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu mee ka mmadụ mata nke bụ eziokwu banyere ihe mere anyị ji na-ata ahụhụ. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”

Aịzaya kọwara otú a ga-esi agbanwe ngwá agha ka ọ ghọọ ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ubi. Nke a na-egosi na Ndị Kraịst ga-abụ ndị na-eme udo. (Aịzaya 2:4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmata ihe bụ uche Chineke n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Mesaya Mezuru Amụma

Aịzaya kwuru na Mesaya ahụ ga-ekwusa ozi ọma n’ógbè Galili. Jizọs mezuru amụma ahụ mgbe ọ gazuru Galili dum, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Lee M! Ziga M”

Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ihe a Aịzaya mere wepụta onwe ya ịrụ ọrụ? Mụta ihe n’aka otu ezinụlọ kwagara ebe e nwere mkpa ka ukwu.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ihe Ọmụma Jehova Ga-ejupụta Ụwa

Olee otú amụma Aịzaya gbasara mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs si mezuo n’oge gara aga. Oleekwa otú ọ ga-esi mezuo ugbu a, nakwa n’ọdịniihu?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-emeri Ịkpa Ókè Agbụrụ

Otú mmadụ abụọ bụbu ndị iro si bụrụzie ụmụnna, na-egosi na nkụzi Chineke na-akpa ike dị egwu.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Mmadụ Iji Ikike O Nwere Eme Ihe Na-ekwesịghị Ekwesị Na-eme Ka A Napụ Onye Ahụ Ikike Ahụ

Olee ihe Shebna gaara eji ikike o nwere mee? Gịnị mere Jehova ji jiri Elayakim dochie ya?