Ihe I Nwere Ike Ikwu
TETA!
Ajụjụ: Ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ ka ahụ́ gbasie ha ike. Gịnị ka i chere anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-arịakarị ọrịa?
Amaokwu Baịbụl: Ilu 22:3
Otú a ga-esi enye ya: Teta! a kwuru ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-ebutekarị ọria.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị anyị na-ata, ka ò nwere ihe ndị ọzọ na-akpata ya?
Amaokwu Baịbụl: Job 34:10
Eziokwu: Ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ndị anyị na-ata. Kama, ahụhụ anyị na-ata na-esikarị n’aka Ekwensu, n’aka ndị mmadụ na-eme mkpebi ọjọọ, nakwa mgbe ụfọdụ ma anyị nọrọ n’ebe anyị na-ekwesịghị ịnọ n’oge na-ekwesịghị ekwesịghị. Ma ọ bụrụ na anyị atawa ahụhụ, Chineke na-enyere anyị aka, n’ihi na ihe gbasara anyị na-emetụ ya n’obi.
OLEE URU ỊMỤ BAỊBỤL GA-ABARA GỊ? (Vidio)
Ajụjụ: Ì chere na ọ bụ Chineke na-achị ụwa? [Chere ka ọ zaa.] Ihe Baịbụl kwuru nwere ike iju gị anya. Vidio a ga-akọwara gị ya. [Kpọnyere ya vidio ahụ.]
Otú a ga-esi enye ya: Isi nke 11 n’akwụkwọ a kọwara ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ ka dịrị, na ihe ọ ga-eme maka ya. [Nyezie ya akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị.]
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.