OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Lee M! Ziga M”
Anyị kwesịrị iṅomi ihe a Aịzaya mere wepụta onwe ya ịrụ ọrụ. O gosiri na o nwere okwukwe, wepụta onwe ya ije ozi a dị mkpa na-agbanyeghị na ọ machaghị ihe a chọrọ ka o mee. (Aịza. 6:8) Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa? (Ọma 110:3) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ibu ụzọ “gbakọọ ihe ọ ga-efu.” (Luk 14:27, 28) Anyị kwesịkwara ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ n’ihi ozi ọma. (Mat. 8:20; Mak 10:28-30) Dị ka anyị hụrụ na vidio ahụ bụ́ Ịkwaga n’Ebe A Chọkwuru Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma, ngọzi Jehova ga-agọzi anyị ga-akarị ihe ọ bụla anyị hapụrụ.
UNU LECHAA VIDIO AHỤ, ZAANỤ AJỤJỤ NDỊ A NA-ESONỤ:
-
Gịnị ka ndị ezinụlọ Williams mere iji nwee ike ịkwaga Ekwedọ?
-
Olee ihe ndị ha chebaara echiche tupu ha ekpebie ebe ha ga-akwaga?
-
Olee otú Jehova si gọzie ha?
-
Olee ebe i nwere ike isi chọta ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu?
N’OFUFE EZINỤLỌ ỌZỌ UNU GA-ENWE, TỤLEENỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú ezinụlọ anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi? (km 8/11 5-7)
-
Ọ bụrụ na anyị agaghị akwagali ebe e nwere mkpa ka ukwuu, olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji nyekwuo aka n’ọgbakọ anyị? (w16.03 3-5)