Mesaya Mezuru Amụma
Ọtụtụ afọ tupu a mụọ jizọs, Aịzaya kwuru na Mesaya ahụ ga-ekwusa ozi ọma “n’ógbè Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ.” Jizọs mezuru amụma ahụ mgbe ọ gazuru Galili dum, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe.—Aịza. 9:1, 2.
-
Ọ rụrụ ọrụ ebube mbụ ya
—Jọn 2:1-11 (na Kena) -
Ọ họpụtara ndịozi ya
—Mak 3:13, 14 (n’ebe dị nso na Kapaniọm) -
O ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ
—Mat. 5:1–7:27 (n’ebe dị nso na Kapaniọm) -
Ọ kpọliteere otu nwaanyị di ya nwụrụ otu nwa nwoke ọ mụtara
—Luk 7:11-17 (na Nen) -
Ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ndị na-eso ụzọ ise mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ
—1 Kọr. 15:6 (na Galili)