Disemba 5- 11
AỊZAYA 1-5
Abụ nke 107 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Aịzaya Na-ekwu.]
Aịza. 2:2, 3—“Ugwu nke ụlọ Jehova” nọchiri anya ofufe dị́ ọcha (ip-1 38-41 ¶6-11; 44-45 ¶20-21)
Aịza. 2:4—Ndị na-efe Jehova anaghị amụkwa otú e si alụ agha (ip-1 46-47 ¶24-25)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Aịza. 1:8, 9—Olee otú e si hapụ “ada bụ́ Zayọn ka ọ nọrọ dị ka ụlọ ndò nke dị n’ubi vaịn”? (w06 12/1 8 ¶5)
Aịza. 1:18—Gịnị ka okwu Jehova bụ́ “Bịanụ ka anyị kpezie” pụtara? (w06 12/1 8 ¶6; it-2-E 761 ¶3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Aịza. 5:1-13
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Kwadebe Otú Anyị Ga-esi Zie Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Kpọnye vidio ndị na-egosi otú anyị ga-esi ezi ozi ọma n’ọnwa a. E lechaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya. Gbaa ụmụnna ume ka ha dee otú ha ga-esi eme nke ha.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 7) Ma ọ bụ unu atụlee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ. (yb16 32 ¶3–34 ¶1)
“Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Akwụkwọ ‘Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke’ Ruo Ndị Mmadụ n’Obi”: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị e kenyere ihe omume ọmụmụ Baịbụl n’agba a na-akpọ Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma n’ọnwa a ka ha mee ihe e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi peeji nke 261-262.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 5 ¶1-9
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 154 na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ a ka ha gee tupu ha abụwa ya.