OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” Ruo Ndị Mmadụ n’Obi
IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ndị mmadụ kwesịrị ịmata ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme, ma na-eme ya. Ọ bụ ya ga-eme ka ọ nabata ofufe ha. (Aịza. 2:3, 4) Akwụkwọ nke abụọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmata ihe bụ́ uche Chineke n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. (Hib. 5:14) Anyị kwesịrị ịgbalị ruo ha n’obi mgbe anyị ji akwụkwọ a na-amụrụ ha ihe n’ihi na ọ bụ ya ga-eme ka ha mata na ọ dị mkpa ka ha gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ ha.—Rom 6:17.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
-
Kwadebe ihe unu ga-amụ nke ọma. Burukwa mkpa onye ị na-amụrụ ihe n’obi mgbe ị na-akwadebe ya. Kwadebekwa ajụjụ ndị ị ga-ajụ ya iji chọpụta ihe bụ́ echiche ya gbasara ihe unu na-amụ.—Ilu 20:5; be 259
-
Jiri igbe ndị dị n’akwụkwọ ahụ mee ka ọ ghọta uru ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara ya
-
Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ichebara ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha echiche, tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. Ekpebikwarala ya ihe ọ ga-eme.—Gal. 6:5
-
Jiri akọ chọpụta ma ò nwere ihe ndị Baịbụl kwuru na-esiri ya ike ime. Gbazie ya ume ka ọ gbalịa mee ihe ndị ahụ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ.—Ilu 27:11; Jọn 14:31