“Ka Anyị Gbagoo n’Ugwu Jehova”
“Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ” |
Oge a anyị nọ na ya ugbu a |
“Ugwu nke ụlọ Jehova” |
Ofufe Jehova dị́ ọcha |
“Mba niile ga-enubakwa n’ime ya” |
Ndị na-efe ofufe dị́ ọcha na-efekọ Chineke ọnụ |
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova” |
Ndị na-efe ofufe dị́ ọcha na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro ha |
“Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya” |
Jehova ji Okwu ya na-akụziri anyị ihe ndị na-enyere anyị aka ịna-eje ije n’ụzọ ya |
“Ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha” |
Aịzaya kọwara otú a ga-esi agbanwe ngwá agha ka ọ ghọọ ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ubi. Nke a na-egosi na Ndị Kraịst ga-abụ ndị na-eme udo. Olee ihe ndị e ji alụ agha n’oge Aịzaya? |
‘Mma agha ka ha bụrụ mma ogè’ |
1 A na-etinye mma ogè n’osisi e ji akọ ala anụmanụ na-adọkpụ. A na-eji ọla kọpa ma ọ bụ ọla nchara arụ ụfọdụ n’ime ha.—1 Sam. 13:20 |
‘Ube ka ha bụrụ mma ịkwa osisi’ |
2 Mma ịkwa osisi na-adị ka mma a e sere ebe a. A na-eji ụdị mma a akwa osisi vaịn.—Aịza. 18:5 |