Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Inyere Ndị “Nwere Ezi Obi” Aka Ịghọ Ndị Na-eso Ụzọ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Inyere Ndị “Nwere Ezi Obi” Aka Ịghọ Ndị Na-eso Ụzọ

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Jehova na-eme ka mkpụrụ eziokwu a kụrụ n’obi ndị niile “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” too. (Ọrụ 13:48; 1 Kọr. 3:7) Anyị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge na ike anyị na-enyere ndị na-eme ihe ndị ha na-amụta aka. (1 Kọr. 9:26) Anyị kwesịrị ime ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ghọta na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim iji nweta nzọpụta. (1 Pita 3:21) Anyị na-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ ma ọ bụrụ na anyị ana-akụziri ha otú ha ga-esi eme mgbanwe ná ndụ ha, otú e si ekwusa ozi ọma na otú e si akụzi ihe, nakwa otú ha ga-esi enyefe Jehova onwe ha.—Mat. 28:19, 20.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chetara ndị ị na-amụrụ Baịbụl na ihe mere unu ji na-amụ ihe bụ ka o nyere ha aka “ịmata” Jehova nke ọma nakwa ịmụta ime ihe dị ya mma.—Jọn 17:3

  • Nyere ha aka ịmụta otú ha ga-esi akwụsị ịkpa àgwà ọjọọ ụfọdụ ha na-akpa nakwa otú ha ga-esi akwụsị iso ndị ọjọọ na-akpa, ka ha nwee ike inwe ọganihu

  • Na-enyere ha aka ime ka okwukwe ha sie ike, na-agbakwa ha ume tupu ha emee baptizim nakwa mgbe ha mechara.—Ọrụ 14:22

LEENỤ VIDIO BỤ́ JEHOVA CHINEKE GA-ENYERE GỊ AKA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị nwere ike ime ka ụjọ na-atụ ụfọdụ inyefe Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim?

  • Olee otú ndị okenye ga-esi enyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka inwe ọganihu?

  • Gịnị ka ihe e dere n’Aịzaya 41:10 na-akụziri anyị gbasara Jehova?

  • Olee àgwà ndị nwere ike inyere anyị aka ife Jehova otú dị ya mma n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?

Olee otú anyị na Jehova si arụkọ ọrụ iji nyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ?