Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Abụ Na-eto Jehova

Jiri Abụ Na-eto Jehova

Pọl na Saịlas ji abụ too Jehova mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 16:25) O doro anya na ịbụ abụ n’oge ahụ nyeere ha aka ịtachi obi. Gịnịkwanụ banyere anyị taa? Ịbụ abụ ndị anyị jị amụ ihe n’ọmụmụ ihe nakwa ịgụ egwú ndị nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị nwere ike ịgba anyị ume ma nyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge nsogbu. Ha na-emekwa ka anyị too Jehova. (Ọma 28:7) A gbaala anyị ume ka anyị buru ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime abụ anyị n’isi. Ị̀ gbalịala ime ya? Anyị nwere ike iji oge anyị ji enwe ofufe ezinụlọ mụọ abụ anyị, ma gbalịa ibu ya n’isi.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỤMỤAKA NDỊ JI ABỤ NA-ETO JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee uru ịbụ abụ Alaeze anyị na-abara anyị?

  • Olee otú ngalaba na-ahụ maka Vidio na Ihe A Na-egere Egere si akwadebe maka itinye abụ na teepụ?

  • Olee otú ụmụaka na ndị ezinụlọ ha si akwadebe maka abụ a ga-etinye na teepụ?

  • Olee abụ Alaeze ndị kacha amasị gị, n’ihi gịnịkwa?