Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị nọ n’otu ọgbakọ nọ na-ege ntị n’ihe òtù na-achị isi kpebiri

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 15-16

Mkpebi E Si n’Okwu Chineke Jiri Otu Obi Mee

Mkpebi E Si n’Okwu Chineke Jiri Otu Obi Mee

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú e si dozie nsogbu ahụ?

15:1, 2—Na-enwe ndidi, na-adịkwa umeala n’obi. Kama ịchọwa idozi okwu ahụ n’onwe ha, Pọl na Banabas wegaara ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova okwu ahụ.

15:28, 29—Tụkwasị Nzukọ Jehova Obi. Obi siri ndị nọ n’ọgbakọ ike na Jehova ga-esi n’aka Jizọs Kraịst, jirikwa mmụọ nsọ ya dozie okwu ahụ.

16:4, 5—Na-erube isi. A bịara nwee udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ dị iche iche n’ihi na ha rubere isi ná ntuziaka òtù na-achị isi nyere.