Onye Mmegide Obi Tara Mmiri, Aghọọ Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
Sọl mere ihe ọ mụtara ozugbo. Gịnị mere o ji mee ya ebe ọtụtụ ndị hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ emeghị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-atụ egwu Chineke karịa mmadụ, obi dịkwa ya ụtọ maka ebere Kraịst meere ya. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma e mebeghị gị baptizim, ị̀ ga-eṅomi Sọl ma mee ihe ị na-amụta ozugbo?