Disemba 31–Jenụwarị 6
ỌRỤ NDỊOZI 19-20
Abụ nke 103 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Na-elezinụ Onwe Unu na Ìgwè Atụrụ ahụ Dum Anya”: (Nkeji 10)
Ọrụ 20:28—Ndị okenye na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ (w11 6/15 20-21 ¶5)
Ọrụ 20:31—Ndị okenye na-enyere ndị nọ n’ọgbakọ aka ma n’ehihe ma n’abali, mgbe ọ bụla enyemaka dị ha mkpa (w13 1/15 31 ¶15)
Ọrụ 20:35—Ndị okenye ga na-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ (bt 172 ¶20)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọrụ 19:9—Olee otú Pọl onyeozi si gosi anyị ihe nleranya n’ịrụsị ọrụ ike na ime mgbanwe n’ozi ọma? (bt 161 ¶11)
Ọrụ 19:19—Olee ihe ndị Efesọs mere anyị kwesịrị iṅomi? (bt 162-163 ¶15)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọrụ 19:1-20
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyekwa onye ahụ Kaadị JW.ORG.
Nletaghachi nke Atọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ nakwa ajụjụ ị ga-aza n’oge ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) jl isi nke 15
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-azụ Ụmụ Okorobịa Na-agba Mbọ Ka Ha Ruo Eruo Ije Ozi n’Ọgbakọ: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Zaakwanụ ajụjụ ndị a: Olee ọrụ dị mkpa ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ? (Ọrụ 20:28) Gịnị mere ndị okenye ga-eji nọgide na-azụ ndị ọzọ? Olee otú ndị okenye ga-esi eṅomi otú Jizọs si zụọ ndịozi ya? Olee otú ụmụnna ndị a na-azụ kwesiri isi na-ele ọzụzụ a na-enye ha anya? (Ọrụ 20:35; 1 Tim. 3:1) Olee ihe ụfọdụ ndị okenye nwere ike ịgwa ndị ha na-enye ọzụzụ ka ha na-eme iji zụọ ha? Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-ele ndị ha na-azụ anya?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 48
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 118 na Ekpere