Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MKPUGHE 17-19

Agha Chineke Ga-akwụsị Agha Niile

Agha Chineke Ga-akwụsị Agha Niile

19:11, 14-16, 19-21

Gịnị mere Jehova, bụ́ “Chineke nke ịhụnanya na nke udo,” ga-eji dunye Ọkpara ya, bụ́ “Onyeisi Udo,” ka ọ lụọ agha?2 Kọr. 13:11; Aịza. 9:6.

  • Jehova na Jizọs hụrụ ezi omume n’anya ma kpọọ ajọ omume asị

  • Ọ gwụla mgbe e bibiri ndị ajọ omume ka a ga-enwe udo na-adịgide adịgide, mmegbu akwụsịkwa

  • Ịnyịnya ọcha na ákwà linin ọma nke na-acha ọcha, dịkwa ọcha e kwuru okwu ha na-egosi na ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe “na-alụ agha n’ezi omume”

Gịnị ka anyị ga-eme ka a zọpụta anyị n’agha a ga-adị egwu?—Zef. 2:3