Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ime Mgbanwe

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ime Mgbanwe

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ na-akpọ ụdị mmadụ niile ka ha “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Mmiri ahụ na-anọchi anya ihe niile Jehova na-eme iji napụta ndị na-erubere ya isi n’aka mmehie na ọnwụ. Ka anyị nwee ike inyere ndị si ebe dị iche iche na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche aka, anyị kwesịrị izi onye nke ọ bụla n’ime ha “ozi ọma ebighị ebi” otú ọ ga-eru ha n’obi.—Mkpu. 14:6.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Họrọ isiokwu na amaokwu Baịbụl ga-eru ndị mmadụ n’obi n’ókèala unu. I nwere ike iji ihe ndị gbara n’ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ i jirila zie mmadụ ozi ọma, ya eruo ya n’obi mee ya. Olee isiokwu na amaokwu Baịbụl ndị na-amasịkarị ndị mmadụ? È nwere akụkọ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ? Olee ihe ga-amasị nwoke ma ọ bụ nke ga-amasị nwaanyị?

  • Kelee ndị mmadụ ma gwa ha okwu otú e si eme n’ókèala unu.—2 Kọr. 6:3, 4

  • Mara akwụkwọ na vidio ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe i nwere ike igosi onye nwere mmasị

  • Danloduo ihe ndị dị n’asụsụ ndị i nwere ike izute n’ozi ọma na-asụ

  • Mee ka ihe ị na-ekwu daba n’ọnọdụ onye ị na-ezi ozi ọma. (1 Kọr. 9:19-23) Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-ekwu ma ị mata na mmadụ nwụnahụrụ onye ị chọrọ izi ozi ọma na nso nso a?

LEENỤ VIDIO AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee isiokwu onye nkwusa ahụ ji malite izi onye nwe ụlọ ozi ọma?

  • Gịnị ka ya na onye nwe ụlọ ahụ na-alụ?

  • Olee amaokwu Baịbụl o kwesịrị ịgụrụ onye nwe ụlọ ahụ, n’ihi gịnịkwa?

  • Olee otú ị na-esi agbanwe otú i si ezi ozi ọma ka ọ masị ndị nọ n’ókèala unu?