Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MKPUGHE 10-12

E Gburu ‘Ndị Àmà Abụọ,’ E mechaa Kpọlite Ha

E Gburu ‘Ndị Àmà Abụọ,’ E mechaa Kpọlite Ha

11:3-11

  • ‘Ndị àmà abụọ’: Ha bụ obere ìgwè ndị e tere mmanụ na-edu ndú n’ọgbakọ mgbe e hiwere Alaeze Chineke n’afọ 1914

  • E gburu ha: Mgbe ha yi “ákwà iru uju” kwusachaa ozi ọma ruo afọ atọ na ọkara, ‘e gburu ha’ mgbe a tụrụ ha mkpọrọ si otú ahụ manye ha ịnọ n’ekwusaghị ozi ọma

  • A kpọlitere ha: Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ihe atụ ahụ gwụchara, ha dịghachiri ndụ mgbe a tọhapụrụ ha na mkpọrọ, ha amalitekwa ịhazi ọrụ ikwusa ozi ọma