Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 12-13

Mụta Ihe n’Iwu E Nyere Ụmụ Izrel Gbasara Ekpenta

Mụta Ihe n’Iwu E Nyere Ụmụ Izrel Gbasara Ekpenta

13:4, 5, 45, 46, 52, 57

Gịnị ka ihe mere e ji nye ụmụ Izrel iwu gbasara ekpenta na-akụziri anyị gbasara ịgba mbọ hụ na o nweghị ihe ga-eme adịm ná mma anyị na Jehova?

  • Jehova gwara ndị nchụàjà otú ha ga-esi mata ekpenta ngwa ngwa. Taa, ndị okenye kwesịrị inyere onye ọ bụla enyemaka dị mkpa aka n’egbughị oge ka ya na Jehova dịkwuo ná mma.—Jems 5:14, 15

  • A gwara ụmụ Izrel ka ha bibie arịa ndị nwere ekpenta ka ha ghara ibufe ihe ọzọ ma ọ bụ ndị ọzọ ekpenta ahụ. Ndị Kraịst kwesịkwara ịdị njikere ibibi ihe ọ bụla, ma ihe ndị dị ha ezigbo mkpa, nwere ike ime ka ha mee mmehie. (Mat. 18:8, 9) O nwere ike ịbụ àgwà riri mmadụ ahụ́, mkpakọrịta ọjọọ, ma ọ bụ ihe e ji atụrụ ndụ, ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ

Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi gosi na ọ chọsiri ike ịnabata enyemaka Jehova?