Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 14-15

Anyị Kwesịrị Ịna-adị Ọcha Iji Na-efe Jehova Ofufe Dị Ọcha

Anyị Kwesịrị Ịna-adị Ọcha Iji Na-efe Jehova Ofufe Dị Ọcha

15:13-15, 28-31

Iji nọgide n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị ịna-adị ọcha ma n’ime ma n’elu ahụ́. Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jehova chọrọ n’ihe gbasara ịdị ọcha, ma n’ahụ́ anyị ma n’omume anyị ma n’otú anyị si efe ya, n’agbanyeghị otú ụwa anyị bi na ya si eme omume. Anyị ga-ezere ịmetụ ihe ọ bụla Nna anyị nke eluigwe weere ka ihe na-adịghị ọcha aka.

Olee otú izere omume na-ezighị ezi juru n’ụwa a ga-esi baara m uru?