OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Dị Njikere Itinye Akwụkwọ Ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?
Ị̀ na-eje ozi oge niile? Ị̀ nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ ruo afọ iri isii na ise? Ahụ́ ọ̀ gbasiri gị ike, gị enweekwa ike ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ ndị a, ì cheela ma i nwere ike itinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze? Kemgbe e nwechara klas nke mbụ, ọtụtụ puku ndị di na nwunye na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye etinyela akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ a. Ma, anyị ka chọkwuru ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị itinye akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ a. Rịọ Jehova ka o mee ka ime uche ya na-atọkwu gị ụtọ, ka o nyekwara gị aka ịna-eṅomikwu Ọkpara ya. (Ọma 40:8; Mat. 20:28; Hib. 10:7) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịchọ otú ị ga-esi belata ọrụ ego ị na-arụ ma ọ bụ ihe ndị dịịrị gị ka i nwee ike iru eru ịga ụlọ akwụkwọ a.
Olee ụdị ozi ndị a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ a nwere ike ije? E nweela ụfọdụ ndị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a e zigara ka ha jewe ozi n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ. Alaka ụlọ ọrụ akwadokwala ndị ọzọ ka ha na-anọ n’ebe anyị na-edosa akwụkwọ anyị n’ebe ndị na-ekwo ekwo n’obodo dị iche iche. E nwekwara ndị na-emecha bụrụ ndị na-arụchitere ndị nlekọta sekit ọrụ, ndị nlekọta sekit, ma ọ bụkwanụ ndị ozi ala ọzọ. Ka ị na-eche banyere ihe ndị i nwere ike ime n’ozi Jehova, nwee ụdị àgwà Aịzaya onye amụma nwere. O kwuru, sị: “Lee m! Ziga m.”—Aịza. 6:8.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ OZI ALA ỌZỌ NA-ARỤ ỌRỤ IWE IHE UBI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú e si ahọpụta ndị ozi ala ọzọ?
-
Olee ezi ọrụ ndị ozi ala ọzọ na-arụ?
-
Olee ngọzi ụfọdụ ije ozi ala ọzọ na-eweta?