Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 16-17

Gịnị Ka Ị Na-amụta n’Ihe A Na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?

Gịnị Ka Ị Na-amụta n’Ihe A Na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?

16:12-15

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esure n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?

  • Ekpere ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọma 141:2) Nnukwu onye nchụàjà na-eweta ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova otú gosiri na ọ na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù. Anyị kpewe ekpere, anyị kwesịrị ikpe ya otú ga-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù

  • Nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ tupu ya achụọ àjà. Ime ihe a na-eme ka o doo ya anya na o meela ihe niile Chineke chọrọ ka o mee tupu ya achụọ àjà ahụ. Otú ahụ ka Jizọs si buru ụzọ mee ihe ga-eme ka Jehova nwee ike ịnabata àjà ọ na-aga ịchụ. Otú o si mee ya bụ ibu ụzọ rubere ya isi

Olee ihe m ga-eme iji hụ na Jehova ga-anabata àjà m?