OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ịkwado Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Ga-egosi na Anyị Hụrụ Jehova na Onye A Dọrọ Aka ná Ntị n’Anya
E nwee onye na-eme mmehie na-achọghị ichegharị, a na-achụ ya n’ọgbakọ. Ihe a na-eme ka ọgbakọ dị ọcha, e sikwa otú ahụ dọọ onye ahụ aka ná ntị. (1 Kọr. 5:6, 11) Ọ bụrụ na anyị akwado ndokwa a Jehova mere, ọ ga-egosi na anyị hụrụ Jehova na onye a chụrụ n’ọgbakọ n’anya. Ọ bụrụkwanụ na obi gbawara ndị niile ma onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ, ma ndị ezinụlọ ya ma kọmitii kpere ikpe ya?
Karịchaa ihe niile, anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya. Anyị kwesịrị iji iwu ya kpọrọ ihe ma zere ime ihe ga-eme ka a kọchawa ya. (1 Pita 1:14-16) Anyị kwesịkwara igosi na anyị hụrụ onye a chụrụ n’ọgbakọ n’anya. Ọ bụ eziokwu na ịdọ aka ná ntị nwere ike iwute mmadụ, ma ọ na-amị “mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Hib. 12:5, 6, 11) Ọ bụrụ na anyị esoro onye a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ onye kewapụrụ onwe ya n’ọgbakọ na-akpakọrịta, anyị anaghị akwado ịdọ aka ná ntị Jehova. Cheta na Jehova na-agbazi ma ọ bụ na-adọ mmadụ aka ná ntị “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jere. 30:11) Anyị na-atụ anya na onye a chụrụ n’ọgbakọ ga-emecha lọghachikwuru Nna anyị bụ́ onye ebere. Ma ka ọ dịgodi, ka anyị na-akwado Jehova ma na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke dị n’ezigbo mma mgbe a dọrọ onye anyị hụrụ n’anya aka ná ntị.—Aịza. 1:16-18; 55:7.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRINỤ OTU OBI NA-AKWADO JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú obi na-adị ndị mụrụ ụmụ ma nwa ha hapụ Jehova?
-
Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ndị ezinụlọ nke onye a chụrụ n’ọgbakọ aka?
-
Olee akụkọ Baịbụl na-egosi na anyị kwesịrị ịkwado Jehova karịa onye ezinụlọ anyị?
-
Olee otú anyị ga-esi na-akwado Jehova karịa ezinụlọ anyị?