Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Otú a ga-esi enye ya: M wetaara gị Teta! ọhụrụ.

Ajụjụ: Legodị ajụjụ dị́ na peeji ya nke abụọ. Gịnị ka i chere bụ azịza ya?

Amaokwu Baịbụl: Luk 7:35 Isiokwu Teta! a kọwara otú ihe a e kwuru n’amaokwu Baịbụl a si gbasa Baịbụl n’onwe ya.

TETA!

 

Ajụjụ: Ì chere na ihe e kwuru n’ebe a anyị ga-agụ na Baịbụl ga-abara mmadụ uru ma onye ahụ na-eme ya?

Amaokwu Baịbụl: Mat. 6:34

Otú a ga-esi enye ya: [Gosi ya isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru—Nchegbu.”] Isiokwu a kwuru otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị.

Baịbụl Na-akụziri Anyị

Ajụjụ: Ọ na-agụ ọtụtụ ndị kweere na Chineke agụụ ka ha nọrọ ya nso. Ị̀ ma na Baịbụl gwara anyị ka anyị bịa Chineke nso?

Amaokwu Baịbụl: Jems 4:8a

Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a ga-eme ka anyị mara otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka anyị mụtakwuo gbasara Chineke. [Gosi ya ihe ụfọdụ dị́ n’isiokwu nke 1 n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị.]

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

 

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.