Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 21-27

Job Ekweghị Ka E Jiri Ụgha Megharịa Ya Anya

Job Ekweghị Ka E Jiri Ụgha Megharịa Ya Anya

Setan na-eji ụgha dị iche iche eme ka ndị na-efe Chineke daa mbà. N’okpuru ebe a, e dere ụgha ụfọdụ Ekwensu ghara n’akwụkwọ Job. Chọpụta otú ha si dị iche n’otú Jehova si ele ihe anya. Deekwa amaokwu Baịbụl ndị ọzọ ị ma na-egosi na Chineke hụrụ gị n’anya.

ỤGHA EKWENSU

OTÚ JEHOVA SI ELE IHE ANYA

Chineke dị oké elu, o nweghị ihe ọ bụla mmadụ mere ga-abụ ezi omume n’anya ya. O nweghị onye ga-emeli ihe dị ya mma (Job 4:18; 25:5)

Jehova ji mbọ anyị na-agba irubere ya isi kpọrọ ihe (Job 36:5)

Mmadụ abaghị uru n’anya Chineke (Job 22:2)

Jehova ji ozi anyị na-ejere ya kpọrọ ihe, ọ na-agọzikwa ndị na-efe ya (Job 33:26; 36:11)

Chineke achọghị ịma ma ị̀ na-erubere ya isi (Job 22:3)

Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ (Job 36:7)