Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 33-37

Ezigbo Enyi Na-enye Ndụmọdụ Bara Uru

Ezigbo Enyi Na-enye Ndụmọdụ Bara Uru

Mgbe Elaịhu tinyere ọnụ n’okwu Job na ndị enyi ya ndị ọzọ nọ na-ekwu, ndụmọdụ o nyere Job dị nnọọ iche na nke Elifaz, Bildad, na Zofa. Otú o si gwa Job okwu dịkwa iche. Ihe a o mere gosiri na ọ bụ ezigbo enyi Job, bụrụkwa ezigbo onye ndụmọdụ. Anyị kwesịkwara iṅomi ya.

EZIGBO ONYE NDỤMỌDỤ

ELAỊHU MERE IHE ANYỊ KWESỊRỊ IṄOMI

32:4-7, 11, 12; 33:1

 

  • NA-ENWE NDIDI

  • NA-EGE NTỊ NKE ỌMA

  • NA-AKWANYERE MMADỤ ÙGWÙ

 
  • Elaịhu cheere ka ndị tọrọ ya kwuchaa okwu tupu ya ekwuo nke ya

  • Ntị o gere mere ka ọ ghọta ihe a na-ekwu nke ọma tupu ya enyewe ndụmọdụ

  • Ọ kpọrọ Job aha, gwakwa ya okwu otú enyi si agwa enyi ya okwu

 

33:6, 7, 32

 

  • DỊ OBI UMEALA

  • DỊ MFE MBỊAKWUTE

  • NA-ENWE ỌMỊIKO

 
  • Elaịhu nwere obiọma, dị umeala n’obi, kwetakwa na ya ezughị okè

  • Ahụhụ Job na-ata wutere ya

 

33:24, 25; 35:2, 5

 

  • NA-ELE IHE ANYA OTÚ DỊ MMA

  • NA-ADỊ OBIỌMA

  • NA-ATỤ EGWU CHINEKE

 
  • Elaịhu ji obiọma gwa Job na otú o si ele ihe anya adịchaghị mma

  • Elaịhu nyeere Job aka ịghọta na ezi omume ya abụghị ihe ka mkpa

  • Ezigbo ndụmọdụ Elaịhu nyere Job kwadebere obi ya maka ihe ndị ọzọ Jehova ga-agwa ya