Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Mgbakọ Ukwu

Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Mgbakọ Ukwu

N’afọ ọ bụla, anyị na-achọsi ike ka mgbakọ ukwu ruwe eruwe n’ihi na anyị na-amụta ọtụtụ ihe na ya. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị mụta ihe ndị ga-enyere ha aka. (Ọma 34:8) Ndị okenye ọgbakọ ọ bụla ga-ekpebi otú kacha mma a ga-esi enye ndị niile nọ́ n’ókèala ha akwụkwọ ịkpọ òkù.

IHE NDỊ ANYỊ GA-EBURU N’UCHE

  • Olee mgbe ọgbakọ anyị ga-aga mgbakọ ukwu?

  • Olee mgbe anyị ga-amalite ịkpọ ndị mmadụ òkù?

  • Olee ụbọchị ndị ọgbakọ anyị ji aga ozi ọma?

  • Olee ụbọchị ndị m ga-eso aga ịkpọ ndị mmadụ òkù?

  • Olee ndị m ga-akpọ òkù?

IHE Ị GA-EKWU

I kelechaa onye ị gara na nke ya, gị asị ya:

“Anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ ukwu anyị ga-enwe. E dere ụbọchị anyị ga-aga ya, oge anyị ga-eji malite, na ebe a ga-enwe ya n’akwụkwọ a. Ọ ga-amasị anyị ka ị bịa.”

OTÚ Ị GA-ESI NYEKWUORO ONYE NWERE MMASỊ AKA

Anyị ga-agbalị ka anyị kpọọ ndị niile nọ́ n’ókèala anyị òkù. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ chọpụta ndị nke nwere mmasị ma nyekwuoro ha aka.

Anyị nwere ike inyekọta mmadụ magazin na akwụkwọ ịkpọ òkù na Satọdee na Sọnde.