Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ndị A Ga-eburu n’Obi Banyere Mgbakọ Ukwu

Ihe Ndị A Ga-eburu n’Obi Banyere Mgbakọ Ukwu

Anyị gaa mgbakọ, anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ma Jehova ma ndị ọzọ n’anya otú ahụ anyị na-eme n’oge ndị ọzọ. (Mat. 22:37-39) Ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8, a kọwara otú anyị ga-esi ahụ ndị ọzọ n’anya. Ọ sịrị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. . . . Ịhụnanya adịghị ada ada.” Ka ị na-ekiri vidio bụ́ Ihe Ndị A Ga-eburu n’Obi Banyere Mgbakọ Ukwu, chọpụta otú ị ga-esi gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya ná mgbakọ ukwu nke afọ a.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ HỤRỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA . . .

  • mgbe anyị na-achọta oche?

  • mgbe a chọrọ ịmalite abụ olu ụtọ?

  • n’ebe anyị bi?

  • ma a bịa n’ịrụ ọrụ?