Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ọhụrụ Na-enyere Anyị Aka Izi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

Ihe Ọhụrụ Na-enyere Anyị Aka Izi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

Kemgbe Jenụwarị afọ 2016, e nwere isiokwu na-adị n’azụ Ụlọ Nche anyị na-eji aga ozi ọma. A na-akpọ ya “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?” A na-ede isiokwu a ka ọ na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi jiri isiokwu dị iche iche dị́ na Baịbụl zie ndị mmadụ ozi ọma. Otú e si ede ya yiri otú e si ede traktị. Ọ na-enwe ajụjụ, amaokwu Baịbụl zara ajụjụ ahụ, na ihe ndị ọzọ anyị na mmadụ nwere ike ikwurịta.

Ọ bụrụ na ihe anyị na mmadụ kwurịtara tọrọ ya ụtọ, onye ahụ nwere ike ịchọ ka anyị na ya mụwa Baịbụl. Jiri ihe ọhụrụ a nyere ndị agụụ Okwu Chineke na-agụ aka.—Mat. 5:6.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EME YA:

  1. Jụọ onye ị bịara na nke ya ihe o chere bụ azịza otu n’ime ajụjụ ndị dị n’isiokwu ahụ

  2. Gee ntị ma ọ zawa ya, keleekwa ya

  3. Gụọ amaokwu Baịbụl ahụ dị́ n’okpuru ebe e dere “Ihe Baịbụl Kwuru,” gị agwa ya ka o kwuo ihe ọ ghọtara n’amaokwu ahụ. Ọ bụrụ na ọ ka nwere ohere, gị na ya tụlekwuo otu n’ime ihe ndị dị́ n’ebe e dere “Olee Ihe Ọzọ Anyị Ga-amụta na Baịbụl?”

  4. Nye ya Ụlọ Nche ahụ

  5. Yienụ oge ọzọ unu ga-atụle ajụjụ nke abụọ