Ebe a na-anabata nwanna nwaanyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Eprel 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta!, nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu kụziere mmadụ gbasara Alaeze Chineke. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Kwee Ka Jehova Kpụzie Echiche Gị na Àgwà Gị

Ọkpụite Ukwu ahụ na-akpụzi àgwà anyị, ma anyị kwesịrị ikwe ka ọ kpụzie anyị.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Obi Ụtọ Nabata Ha

Onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe anyị kwesịrị ịchọpụta na anyị nwere ịhụnanya n’etiti onwe anyị. Olee ihe ndị i nwere ike ime iji mee ka udo na ịhụnanya dịkwuo n’ọgbakọ unu?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ì Nwere “Obi Ị Ga-eji Mara” Jehova?

Na Jeremaya isi 24, Jehova ji mkpụrụ fig tụnyere ụmụ mmadụ. Olee ndị dị ka mkpụrụ fig dị mma, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ha taa?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

I Nwere Ike Inyere Ndị Na-adịkwaghị Eje Ozi Aka

Jehova ka ji ndị na-adịkwaghị eje ozi kpọrọ ihe. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaya

Jeremaya buru amụma na Jeruselem ga-abụ ebe tọgbọrọ n’efu. Olee otú o si nwee obi ike ime ya?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ Alaeze Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike

Ịbụ abụ Alaeze nyeere Ndị Kraịst nọ n’ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen aka inwe obi ike. Abụ ndị a nwekwara ike inyere anyị aka idi mkpagbu bịaara anyị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Buru Amụma Banyere Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ

Olee otú ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si dị iche n’ọgbụgba ndụ Iwu, oleekwa otú ọ ga-esi baara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi?