Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 22-24

Ì Nwere “Obi Ị Ga-eji Mara” Jehova?

Ì Nwere “Obi Ị Ga-eji Mara” Jehova?

Jehova ji ụmụ mmadụ tụnyere mkpụrụ fig

24:5

  • Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi a dọọrọ n’agha laa Babịlọn dị ka mkpụrụ fig ndị dị mma

24:8

  • Eze Zedekaya na ndị ọzọ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mere ihe dị njọ, dị ka mkpụrụ fig ndị mebiri emebi

Olee otú anyị ga-esi nweta ‘obi anyị ga-eji mara’ Jehova?

24:7

  • Jehova ga-enye anyị ‘obi anyị ga-eji mara’ ya ma ọ bụrụ na anyị amụọ Okwu ya ma mee ihe anyị mụtara

  • Anyị kwesịrị inyocha obi anyị nke ọma ma wepụ àgwà ọjọọ ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ ọ bụla nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova

Jụọ onwe gị, sị: M̀ nwere ‘obi m ga-eji mara’ Jehova? Olee otú m ga-esi enweta ya?