Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

I Nwere Ike Inyere Ndị Na-adịkwaghị Eje Ozi Aka

I Nwere Ike Inyere Ndị Na-adịkwaghị Eje Ozi Aka

Na Tuzdee, Eprel 11, ọtụtụ ndị na-adịkwaghị eje ozi ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha malitere ịgba ọsọ ndụ, ma n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ha anaghịzi agbasi ọsọ ike. E kwuru banyere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ na broshọ Lọghachikwute Jehova. (Hib. 12:1) Ma, Jehova ka ji ndị a na-adịghị ejekwa ozi kpọrọ ihe n’ihi na ha so ná ndị o ji ọbara Ọkpara ya zụta. (Ọrụ 20:28; 1 Pita 1:18, 19) Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ?

Ndị Okenye ọgbakọ na-agbalị ike ha ịchọ ndị na-adịkwaghị eje ozi iji nyere ha aka otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ sị agba mbọ na-achọ atụrụ ya kpafuru akpafu. (Luk 15:4-7) Ihe a na-egosi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ha nọ. (Jere. 23:3, 4) E wezụga ndị okenye, anyị niile nwekwara ike ịgba ụdị ndị a ume. Jehova na-enwe obi ụtọ maka mbọ ọ bụla anyị gbara iji nyere ụdị ndị a aka, ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ maka ya. (Ilu 19:17; Ọrụ 20:35) Ugbu a, chee echiche ma ò nwere onye i nwere ike ịgba ume, egbukwala oge ịga gbaa onye ahụ ume.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENYERE NDỊ NA-ADỊKWAGHỊ EJE OZI AKA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe nwanna nwaanyị Abbey mere mgbe ọ hụrụ nwanna ọ na-amaghị?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị gwa ndị okenye ma ọ bụrụ na o nwere onye na-adịghị ejekwa ozi anyị chọrọ inyere aka?

  • Olee otú nwanna nwaanyị Abbey si kwadebe maka ịhụ Laura nke ugboro abụọ?

  • Olee otú nwanna nwaanyị Abbey si jiri ndidi na ịhụnanya nọgide na-agba Laura ume?

  • Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere na Luk 15:8-10?

  • Olee uru mbọ niile a gbara iji nyere Laura aka bara?