Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ Alaeze Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike

Abụ Alaeze Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike

Pọl na Saịlas ji abụ too Chineke mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 16:25) N’oge anyị a, ụmụnna anyị bụrụ abụ Alaeze mgbe a tụrụ ha mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị na Sachsenhausen, n’oge ndị Nazi na-achị Jamanị. Ha mekwara otú ahụ mgbe a kpọgara ha Saịberịa. Ihe atụ ndị a na-egosi na abụ nwere ike ime ka Ndị Kraịst jiri obi ike na-edi mkpagbu.

N’ọdịnihu, a ga-ebipụtakwa abụ ọhụrụ anyị bụ́ “Sing Out Joyfully” to Jehovah n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ozugbo anyị nwetara nke anyị, anyị nwere ike ibute abụ ndị dị na ya n’isi ma anyị na-amụ ha n’Ofufe Ezinụlọ anyị. (Efe. 5:19) Mgbe ahụ, mmụọ nsọ ga-eme ka anyị nwee ike icheta ha n’oge mkpagbu. Abụ Alaeze nwere ike inyere anyị aka ilekwasị anya n’olileanya anyị nwere, nyekwara anyị aka idi mkpagbu. Mgbe obi dị anyị mma, mkpụrụ okwu ndị dị mma e ji rọọ abụ ndị ahụ ga-eme ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Jehova abụ n’ihi obi ụtọ juru anyị obi. (1 Ihe 15:16; Ọma 33: 1-3) Ka anyị niile gbalịa na-abụ abụ Alaeze anyị.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ABỤ GBARA NDỊ ỌRỤ UME, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ọnọdụ Nwanna Frost nọ na ya mere o ji rọọ abụ a?

  • Olee otú abụ ahụ si gbaa ụmụnna nọ n’ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen ume?

  • Olee ọnọdụ ndị i nwere ike ịnọ na ya abụ Alaeze agbaa gị ume?

  • Olee abụ Alaeze ị ga-achọ ibute n’isi?