Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 25-28

Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaya

Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaya

Jeremaya kwuru na Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu dị ka Shaịlo

26:6

  • O nwere mgbe igbe ọgbụgba ndụ Jehova dị na Shaịlo, nke na-egosi na Jehova nọ n’etiti ndị ya

  • Jehova kwere ka ndị Filistia buru igbe ọgbụgba ndụ ahụ laa, e bughachighịkwa ya ọzọ na Shaịlo

Ndị nchụàjà, ndị amụma na ndị niile bi na Juda nọ na-achọ igbu Jeremaya

26:8, 9, 12, 13

  • Ha jidere Jeremaya n’ihi amụma o buru megide Jeruselem na ụlọ nsọ ya

  • Ụjọ emeghị ka Jeremaya gbalaga

Jehova chebere Jeremaya

26:16, 24

  • Jeremaya nọgidere na-enwe obi ike, Jehova agbahapụghịkwa ya

  • Chineke ji nwoke nwere obi ike bụ́ Ahaịkam chebe Jeremaya

Enyemaka na agbamume Jehova nyere Jeremaya mere ka o nwee ike ịdọ ndị Juda aka ná ntị ruo afọ 40