Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Obi Ụtọ Nabata Ha

Jiri Obi Ụtọ Nabata Ha

Ole ndị ka anyị ga-eji obi ụtọ nabata? Ọ bụ onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe anyị. Ma ndị bịara ọhụrụ ma ndị dịbu mbụ abịa. (Rom 15:7; Hib. 13:2) O nwekwara ike ịbụ nwanna anyị si mba ọzọ ma ọ bụkwanụ nwanna kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe kemgbe. Were ya na ị bụ otu n’ime ndị a anyị kpọtụrụ aha. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka e jiri obi ụtọ nabata gị? (Mat. 7:12) N’ihi ya, gbalịa gagharịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kelee ndị mmadụ tupu a malite ọmụmụ ihe, nakwa mgbe a gbasara? Ime otú a ga-eme ka obi ụtọ na ịhụnanya dịrị n’ọgbakọ unu. Ọ ga-ewetakwara Jehova otuto. (Mat. 5:16) Ọ bụ eziokwu na ị gaghị enwe ike ikelecha mmadụ niile, ma, obi ga-adị onye ọ bụla ụtọ ma anyị niile gbalịa mee ike anyị. *

Ọ bụghị naanị n’oge anyị na-enwe nnọkọ pụrụ iche ka anyị na-anabata ndị mmadụ nke ọma, dị ka n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kama, anyị kwesịrị ịna-eme otú ahụ mgbe niile. Ndị ọhụrụ hụ ụdị ịhụnanya anyị nwere, o nwere ike ime ka ha too Jehova ma bịa soro anyị fewe ya.—Jọn 13:35.

^ para. 3 Baịbụl kwuru otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha n’ọgbakọ.—1 Kọr. 5:11; 2 Jọn 10.