Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 17-21

Kwee Ka Jehova Kpụzie Echiche Gị na Àgwà Gị

Kwee Ka Jehova Kpụzie Echiche Gị na Àgwà Gị

Kwee ka Jehova na-akpụzi gị

18:1-11

  • Jehova na-eji ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị akpụzi anyị ka anyị nwee ezigbo àgwà

  • Anyị kwesịrị ịna-erubere Jehova isi, na-ekwekwa ka ọ na-akpụzi anyị

  • Jehova anaghị amanye anyị ime ihe anyị na-achọghị ime

Ọkpụite nwere ike ịgbanwe obi ya jiri ụrọ o ji na-akpụ otu ihe kpụọ ihe ọzọ

  • Ebe ọ bụ na Jehova nyere anyị ikike ịhọrọ ihe anyị chọrọ ime, anyị nwere ike ikwe ma ọ bụ jụ ka ọ kpụzie anyị

  • Ọ bụ otú anyị si kpaa àgwà ga-ekpebi otú Jehova ga-esi na-emeso anyị

Olee ebe ndị m chọrọ ka Jehova kpụzie m?