Ebe ụmụnna anyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl na Chek Ripọblik

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Eprel 2018

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Ihe dị iche iche si na Baịbụl gị na mmadụ nwere ike ikwurịta ga-enye aka ịna-enwe obi ụtọ.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Otú Ememme Ngabiga na Ncheta Ọnwụ Jizọs Si Yie na Otú Ha Si Dị Iche

Ihe mere e ji na-eme Ememme Ngabiga n’oge ochie abụghị ka e jiri ya gosi na a ga-emecha mewe Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ma, e nwere ebe ụfọdụ ha abụọ si yie.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Gaanụ Mee Ka Ndị Mmadụ Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M. N’ihi Gịnị, N’ebee, Otú Ole?

Ime ndị na-eso ụzọ pụtara ịkụziri ndị ọzọ ime ihe niile Jizọs nyere n’iwu. Jizọs dunyere anyị ozi ka anyị gaa mee ndị na-eso ụzọ, ya bụ, ịkụziri ndị anyị na-amụrụ ihe idobe iwu ya na ịgbaso nzọụkwụ ya.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Izi Ozi Ọma na Ịkụzi Ihe Dị Mkpa Maka Ime Ndị Na-eso Ụzọ

Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ka ha gaa mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Olee otú ha ga-esi eme ya? Olee otú anyị ga-esi nyere ndị mmadụ aka ịbịa fewe Chineke?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”

Olee ihe anyị na-amụta n’ọrụ ebube ahụ a kọrọ gbasara ya na Mak 2:​5-12? Olee otú ọ ga-esi nyere anyị aka idi ọrịa na-arịa anyị?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ịgwọ Ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike

Olee ihe mere àgwà ndị ndú okpukpe ndị Juu ji wee Jizọs iwe? Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịmata ma ànyị na-enwe ọmịiko ka Jizọs?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jizọs Nwere Ikike Ịkpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Ịtụgharị uche n’ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na a ga-akpọlite ndị nwụnahụrụ anyị.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe Na-akụzi Ihe Nke Ọma

Iji bụrụ aka ochie n’ịkụzi ihe, anyị kwesịrị ịmụta otú e si ejizi ngwá ọrụ anyị ejizi. Olee ngwá ọrụ bụ́ isi anyị ji ekwusa ozi ọma? Olee otú ị ga-esi mụtakwuo iji Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe na-akụzi ihe nke ọma?