Eprel 16-22
MAK 1-2
Abụ nke 130 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio Ihe Akwụkwọ Mak Na-ekwu.]
Mak 2:3-5—Jizọs nweere otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ọmịiko ma gbaghara ya mmehie ya (jy 67 ¶3-5)
Mak 2:6-12—Ọgwụgwọ Jizọs gwọrọ nwoke ahụ gosiri na o nwere ikike ịgbaghara mmadụ mmehie ya (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 2:9)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Mak 1:11—Olee ihe ihe a Jehova gwara Jizọs pụtara? (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ahụ)
Mak 2:27, 28—Olee ihe mere Jizọs ji sị na ya bụ “Onyenwe ụbọchị izu ike”? (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu ahụ)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mak 1:1-15
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. Gosi otú a ga-esi azaghachi onye na-achọghị ịnụ ozi ọma.
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta” mee ya.
Vidio Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 5) Kpọnye vidio ahụ. Kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ọ Bụghị Ndị Ezi Omume Ka M Bịara Ịkpọ, Kama Ọ Bụ Ndị Mmehie”: (Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio aha ya bụ Ndụ M Gbanwere n’Ụlọ Mkpọrọ. Jụzie ajụjụ ndị a: Olee ihe nyeere Donald aka ibidokwa nwewe obi ụtọ? N’ozi ọma, gịnị ga-enyere anyị aka iṅomi Jizọs ma ghara ile mmadụ anya n’ihu?—Mak 2:17.
Jehova Na-agbaghara Mmehie “n’Ụzọ Dị Ukwuu”: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio aha ya bụ Jehova, Ọ Bụ Gị Ga-abụzi Onye Kacha Mkpa ná Ndụ M. Jụzie ajụjụ ndị a: Olee otú Anneliese si lọghachikwute Jehova, gịnịkwa mere o ji lọghachi? (Aịza. 55:6, 7) Olee otú i nwere ike isi jiri ihe mere Anneliese nyere ndị ji nke nta nke nta kwụsị ijere Jehova ozi aka?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 17
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 86 na Ekpere