Eprel 1-7
1 NDỊ KỌRỊNT 7-9
Abụ nke 136 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Mmadụ Ịnọ n’Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye Bụ Onyinye”: (Nkeji 10)
1 Kọr. 7:32—Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-ejeliri Jehova ozi otú ha chọrọ n’ihi na ha anaghị enwe nchegbu ndị lụrụlanụ na-enwe (w11 1/15 17-18 ¶3)
1 Kọr. 7:33, 34—Ndị Kraịst lụrụla di ma ọ bụ nwunye ‘na-echegbu onwe ha maka ihe nke ụwa’ (w08 7/15 27 ¶1)
1 Kọr. 7:37, 38—Ndị Kraịst hapụrụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye iji jekwuoro Jehova ozi ‘ga-eme nke ọma karịa’ Ndị Kraịst lụrụnụ (w96 10/15 12-13 ¶14)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
1 Kọr. 7:11—Olee ihe ndị nwere ike ime ka Onye Kraịst kpebie na ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya ga-ekewa? (lv 220-221)
1 Kọr. 7:36—Gịnị mere Onye Kraịst kwesịrị iji chere ruo mgbe ọ ‘gafere oge ntoju ntorobịa’ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye? (w00 7/15 31 ¶2)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) 1 Kọr. 8:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma, tụleekwanụ ihe ọmụmụ nke 4 na broshọ Izi Ihe.
Okwu: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w12 11/15 20—Isiokwu: Ọ̀ Pụtara na Ndị Kpebiri Ịnọ n’Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye Si n’Ụzọ Pụrụ Iche Nweta Onyinye Ahụ? (th ihe ọmụmụ nke 12)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara Uru: (Nkeji 15) Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee nsogbu ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe? (1 Kọr. 7:39) Gịnị mere e kwesịrị iji ṅomie ada Jefta? Olee ihe Jehova ga-emere ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ? (Ọma 84:11) Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ ga-esi na-agba ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ume? Olee ụfọdụ ihe Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ime ná nzukọ Jehova?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 61
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 42 na Ekpere