Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 14-16

Chineke Ga-abụ “Ihe Niile n’Ebe Onye Ọ Bụla Nọ”

Chineke Ga-abụ “Ihe Niile n’Ebe Onye Ọ Bụla Nọ”

15:​24-28

Ndị ji obi ha niile nọgide na-efe Jehova ruo ọgwụgwụ ga-enweta ọtụtụ ihe ọma n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị ọzọ banyere nkwa ndị Chineke kwere, ọ ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na nkwa ndị ahụ ga-emezu. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha jiri uche ha na-ahụ otú ihe ga-adị ná ngwụcha Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, mgbe Jehovah ga-abụ “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”

Olee nkwa Chineke kacha amasị gị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

Olee ihe mere obi ji sie gị ike na nkwa Chineke ga-emezu?