Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 10-13

Jehova Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Jehova Kwesịrị Ntụkwasị Obi

10:13

Jehova nwere ike kpebie iwepụrụ anyị nsogbu anyị na ya na-alụ. Mana, ọtụtụ mgbe, ihe ọ na-eme bụ ‘imere anyị ụzọ mgbapụ.’ Otú ọ na-esi eme ya bụ inye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka idi ya.

  • O nwere ike iji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na ihe ndị o si n’aka nzukọ ya na-akụziri anyị gbaa anyị ume ma mee ka obi ruo anyị ala.​—Mat. 24:45; Jọn 14:16; Rom 15:4

  • O nwere ike iji mmụọ nsọ ya mee ka anyị cheta akụkọ Baịbụl na ndụmọdụ Baịbụl ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma.​—Jọn 14:26

  • O nwere ike iji ndị mmụọ ozi ya nyere anyị aka. ​—Hib. 1:14

  • O nwekwara ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka. ​—Kọl. 4:11