Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú Ị Ga-esi Kwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Olee Otú Ị Ga-esi Kwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Malite n’afọ a, anyị ga-enwekwu oge anyị ga-eji kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na ọ daba n’ụbọchị dị n’etiti izu, a gaghị enwe Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ. Ọ bụrụkwa na ọ daba ná ngwụcha izu, a gaghị enwe okwu ihu ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ị̀ ga-eji oge a pụtaranụ mee ihe bara uru? N’oge ndịozi Jizọs, e nwere ọtụtụ ihe ndị a na-eme iji kwadebe maka ihe omume a pụrụ iche. (Luk 22:​7-13; km 3/15 1) Anyị kwesịkwara ịkwadebe obi anyị maka ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

Ụfọdụ ụmụnna na-agụ ma tụgharịa uche n’ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke na-adị n’akwụkwọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. O nwere ndị na-agụ amaokwu Baịbụl ndị dị na chaatị dị ebe a, nweekwa ndị na-aga n’Ụlọ Nche gụọ isiokwu ndị kwuru banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa otú Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Nke ọ bụla ị họọrọ ime, ekpere anyị bụ ka o nyere gị aka ịbịarukwu Jehova na Nwa ya nso.