Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eprel 13-19

JENESIS 31

Eprel 13-19

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Jekọb na Leban Agbaa Ọgbụgba Ndụ Udo”: (Nkeji 10)

    • Jen. 31:​44-46​—Jekọb na Leban kpokọtara nkume, nọrọ n’elu ya rie nri ọgbụgba ndụ ahụ (it-1 883 ¶1)

    • Jen. 31:​47-50​—Ha kpọrọ ebe ahụ Galied na Ụlọ Nche (it-2 1172)

    • Jen. 31:​51-53​—Ha kwere ibe ha nkwa na ha agaghị ebuso ibe ha agha

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)

    • Jen. 31:19​—Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya mere Rechel ji zuru terafim nna ya? (it-2 1087-1088)

    • Jen. 31:​41, 42​—Ọ bụrụ na ndị were anyị n’ọrụ bụ ndị “ọ na-esi ike ime ihe dị ha mma,” gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jekọb banyere otú anyị ga-esi na-emeso ha? (1 Pita 2:18; w13 3/15 21 ¶8)

    • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?

  • Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 31:​1-18 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú nwanna nwaanyị ahụ si mee ka onye nwe ụlọ ghọta otú ọ ga-esi eme ihe amaokwu ahụ kwuru? Gịnị ka ọ gwara ya iji mee ka ọ kwadebe maka nletaghachi?

  • Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe gosiri na ọ chọghị ịnụ ozi ọma. (th ihe ọmụmụ nke 4)

  • Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nye ya broshọ Ozi Ọma, jiri isi nke 5 malitere ya ọmụmụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 8)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ