Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 32-33

Ị̀ Na-agba Mgba Iji Nweta Ngọzi?

Ị̀ Na-agba Mgba Iji Nweta Ngọzi?

32:24-28

Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi Jehova, anyị ga-agbalịsi ike bute ihe ndị gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị. (1 Kọr. 9:​26, 27) Ihe Jekọb mere gosiri otú anyị kwesịrị isi na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Anyị ga-egosi na anyị chọsiri ngọzi Jehova ike ma anyị . . .

  • Na-akwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe ọ bụla

  • Na-agachi ozi ọma anya

  • Na-agbalị na-enyere ndị ọzọ aka n’ọgbakọ

N’agbanyeghị otú ihe si siere gị ike, na-arịọ Jehova n’ekpere mgbe niile ka o nyere gị aka, na-agbasikwa mbọ ike ka i nweta ngọzi ya.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ebe ụfọdụ m kwesịrị igbakwu mbọ ka m nwee ike inweta ngọzi Jehova?’