Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Ihe Kacha Mụ Mkpa?

Olee Ihe Kacha Mụ Mkpa?

Jekọb na mmụọ ozi gbara mgba n’ihi na ọ chọrọ inweta ihe kacha ya mkpa, ya bụ, ngọzi Jehova. (Jen. 32:​24-31; Hos. 12:​3, 4) Anyịnwa kwanụ? Ànyị dị njikere ịgbalịsi ike rubere Jehova isi ma nweta ngọzi ya? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a chọrọ ka anyị rụtụkwuo ọrụ n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma oge ahụ bụ oge ọmụmụ ihe, ma ọ bụkwanụ na ụbọchị ọmụmụ ihe dabara n’ụbọchị ahịa, olee nke anyị ga-ahọrọ? Anyị nye Jehova oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere, ya bụ, ihe ndị kacha mma anyị nwere, ọ ga na-awụkwasị anyị ‘ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ anyị.’ (Mal. 3:10) Ọ ga na-edu anyị, na-echebe anyị, ma na-egboro anyị mkpa anyị.​—Mat. 6:33; Hib. 13:5.

LEENỤ VIDIO BỤ́ AHAPỤLA IHE I KPEBIRI IME N’OZI JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú e si jiri ihe na-amasị nwanna nwaanyị ahụ nwaa ya ọnwụnwa?

  • Olee otú ọrụ anyị na-arụ nwere ike isi bụụrụ anyị ọnwụnwa?

  • Gịnị mere Timoti ka ji nweekwa ihe ndị o kpebiri ime n’ofufe Jehova n’agbanyeghị na ọ ghọọla Onye Kraịst ma nke a na-akọ?​—1 Tim. 4:16

  • Olee ihe kacha gị mkpa ná ndụ?

    Olee otú anyị ga-esi eme ka a mata ọrụ nke kacha anyị mkpa?