OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Tụfuonụ Chi Ndị Mba Ọzọ”
Jekọb ma na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ife n’agbanyeghị na Jehova enyebeghị ha iwu ka ha ghara ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:3-5) N’ihi ya, mgbe Jehova gwara Jekọb ka ọ laghachi Betel, Jekọb gwara ndị niile so ya ka ha tụfuo chi ndị mba ọzọ. Jekọb tụfuru chi ndị mba ọzọ ahụ niile, ma ọla ntị ndị ọ ga-abụ na ha ji mere ọtụmọkpọ. (Jen. 35:1-4) O doro anya na ihe ahụ Jekọb mere tọrọ Jehova ụtọ.
N’oge anyị a, olee otú anyị ga-esi nye Jehova ofufe ruuru naanị ya? Ihe mbụ anyị ga-eme bụ izere ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na ikpere arụsị ma ọ bụ ime mgbaasị. Anyị kwesịrị ịtụfu ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na ndị mmụọ ọjọọ. Anyị kwesịkwara ile ma è nwere ihe anyị ji atụrụ ndụ nwere ihe jikọrọ ya na ndị mmụọ ọjọọ. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Akwụkwọ ndị m na-agụ na fim ndị m na-ele ọ̀ bụ ndị nke na-ekwu gbasara ndị amusu, ndị nwụrụ anwụ na-aga ije, na ndị mmụọ? Ò nwere ihe m ji atụrụ ndụ nke na-eme ka ime mgbaasị ma ọ bụ ịkọ ọgwụ yie ihe na-enweghị ihe o mere?’ Anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị kpamkpam.—Ọma 97:10.
LEENỤ VIDIO BỤ́ “NA-EGUZOGIDENỤ EKWENSU,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee nsogbu bịaara otu nwaanyị na-amụ Baịbụl aha ya bụ Palesa?
-
Olee ihe mere o ji dị mma ịgwa ndị okenye ka ha nye aka n’okwu gbasara mgbaasị?
-
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova chebe anyị, olee ihe ndị anyị kwesịrị ibibi?
-
Olee ihe Palesa katara obi mee?
-
N’ebe i bi, olee ihe ụfọdụ gbasara ndị mmụọ ọjọọ i kwesịrị izere?