Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 9-11

Ndị Ji Obi Ha Niile Na-efe Jehova Na-akwado Ihe Niile Gbasara Ofufe Ya

Ndị Ji Obi Ha Niile Na-efe Jehova Na-akwado Ihe Niile Gbasara Ofufe Ya

Ndị Chineke ji obi ha niile kwado ofufe ya

10:28-30, 32-39; 11:1, 2

  • Ndị Izrel kwadebere maka Ememme Ụlọ Ndò, meekwa ya otú kwesịrị ekwesị

  • Ha zukọrọ n’ụbọchị nke ọ bụla ka ha nụ Iwu Chineke. O mekwara ha obi ụtọ

  • Ha kwupụtara mmehie ha, kpee ekpere, rịọkwa Jehova ka ọ gọzie ha

  • Ha kwere nkwa na ha ga na-akwado ihe niile gbasara ofufe Chineke

Ụzọ ndị Izrel si gosi na ha kwadoro ofufe Chineke bụ:

  • Ịlụ naanị ndị na-efe Jehova

  • Iji ego ha na-akwado ofufe Chineke

  • Idebe Ụbọchị Izu Ike

  • Iweta nkụ e ji achụ àjà

  • Inye Jehova mkpụrụ mbụ nke ihe ala ha mepụtara na nwa mbụ anụ ụlọ ha mụrụ