Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHEMAYA 12-13

Ihe Akwụkwọ Nehemaya Na-akụziri Anyị

Ihe Akwụkwọ Nehemaya Na-akụziri Anyị

Nehemaya ji ịnụ ọkụ n’obi kwado ofufe Chineke

13:4-9, 15-21, 23-27

  • Nnukwu onye nchụàjà a na-akpọ Elayashib kwere ka Tobaya, bụ́ onye na-emegide ndị Chineke, na-agwa ya ihe ọ ga-eme

  • Elayashib kwadebeere Tobaya ebe a na-eri ihe n’ụlọ Jehova

  • Nehemaya tụpụsịrị ngwongwo Tobaya niile n’èzí ma mee ka ụlọ Jehova dị ọcha

  • Nehemaya nọgidere na-ewepụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha na Jeruselem