OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kpọọ Ndị Niile Nọ́ n’Ókèala Unu Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs
Febụwarị 22-28
N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Febụwarị, anyị ga-amalite ịkpọ ndị nọ́ n’ókèala anyị òkù ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na anyị enweta onye nwere mmasị ịbịa, anyị kwesịrị inyere ya aka ka ọ bịa.
IHE NDỊ ANYỊ NWERE IKE IME
OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI KPỌỌ MMADỤ ÒKÙ
“Anyị bịara ịgwa unu gbasara ihe dị mkpa anyị ga-eme n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach. N’ụbọchị ahụ, nde kwuru nde ndị mmadụ ga-agbakọ n’ebe dị iche iche icheta ọnwụ Jizọs. A ga-eji Baịbụl kọwaara anyị uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị. E dere ebe anyị ga-anọ eme ya na oge anyị ga-eme ya ná mpempe akwụkwọ a. Biko, gbalịa ka ị bịa.”
E nwere ike ime otu n’ime ihe abụọ ndị a ma ọ bụrụ na onye ahụ nwere mmasị
-
NYE ONYE AHỤ ỤLỌ NCHE
Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
-
KPỌNYERE YA VIDIO GBASARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS
Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
E nwere ike ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ma a gaghachi na nke onye ahụ
-
KPỌNYERE YA VIDIO BỤ́ OLEE URU ỊMỤ BAỊBỤL GA-ABARA GỊ?
Nyezie ya otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.
-
NYE YA AKWỤKWỌ GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?
Jiri ihe nke 16 e dere ná ngwụcha ya kọwakwuoro ya gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Nyezie ya akwụkwọ ahụ.
-
NYE YA BROSHỌ GEE CHINEKE NTỊ
Jirinụ peeji nke 18 na nke 19 tụlee uru ọnwụ Jizọs bara. Nyezie ya broshọ ahụ.