USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Febụwarị 2017
Ihe I Nwere Ike Ikwu
Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta!, nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu mee ka mmadụ mata ihe ndị ga-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Irubere Jehova Isi Na-eweta Ọtụtụ Ngọzi
Jehova na-egosi anyị ụzọ anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Kraịst Tara Ahụhụ n’Ihi Anyị
Ọnwụ Jizọs mere ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan, bụ́ onye na-ekwu na o nweghị ohu Chineke ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Okwukwe Siri Ike n’Ebe Onye Okike Nọ
Gịnị ka ụmụ gị kweere gbasara otú ndụ si malite? Olee otú ị ga-esi nyere ha aka ịmata na ọ bụ Chineke kere ihe niile?
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
‘Kpọsaa Afọ Jehova Na-egosi Ihu Ọma Ya’
Afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya ọ̀ bụ afọ nkịtị? Olee otú ahụ oge ahụ si gbasa ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Enyefusila Akwụkwọ Anyị Aghara Aghara
Ọ dịghị mfe ibipụta akwụkwọ anyị na ibuga ha n’ọgbakọ anyị dị iche iche n’ụwa. Ọ na-efukwa nnukwu ego. N’ihi ya, enyela onye ọ bụla ị hụrụ akwụkwọ anyị.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ
Olee uru nkwa Chineke kwere anyị gbasara “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-abara anyị?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ
Olileanya dị ka arịlịka. Ịtụgharị uche ná nkwa ndị Chineke kwere anyị ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ, na ijidesi okwukwe anyị ike ma ọnwụnwa bịara anyị.