OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Enyefusila Akwụkwọ Anyị Aghara Aghara
Jizọs sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) Anyị na-eme ihe ahụ o kwuru n’ihi na anyị anaghị ere Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị na-enye ndị mmadụ ere. (2 Kọr. 2:17) Ma, ihe e dere n’akwụkwọ ndị a bụ eziokwu si na Baịbụl. Ọ dịghị mfe ibipụta ha ma buga ha n’ọgbakọ anyị dị iche iche n’ụwa. Ọ na-efukwa nnukwu ego. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji were naanị ole anyị ma na anyị ga-enyechali n’ozi ọma.
Enyela onye ọ bụla ị hụrụ akwụkwọ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ mgbe unu nọ ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo. (Mat. 7:6) Kama inye onye ọ bụla na-agafenụ akwụkwọ anyị, gbalịa gwa onye ahụ okwu ka ị mata ma ò nwere mmasị. Ọ bụrụ na mmadụ emee otu n’ime ihe ndị a e depụtara n’aka nri, ọ pụtara na onye ahụ nwere mmasị. Ọ bụrụ na i nweghị ike ịmata ma mmadụ ò nwere mmasị, ọ kacha mma inye onye ahụ traktị. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ asị gị nye ya magazin ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ, i nwere ike inye ya.—Ilu 3:27, 28.